2 Corinthians 8

Ihe onyinye maka ndị nsọ

1Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia. 2Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ. 3Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta. 4Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 5Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha. 6Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi. 7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a.

8Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa. 9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.

10Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya. 11Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị. 12Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.

13Nzube m abụghị ka unu nye nʼụzọ ihe ga-esi siere unu ike nʼihi na unu nyere. Kama ka e nwe nhatanha. 14Ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa, ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enwe nhatanha. 15Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ahụ chịkọtara hie nne enweghị karịa. Onye nke chịkọtara ihe dị nta enweghị ihe fọdụrụ ya inweta ihe ọ chọrọ.” a

Nzipụ Taịtọs ka ọ gaa Kọrint

16Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi. 17Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka. 18Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ. 19Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka. 20Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a. 21Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa.

22Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ. 23Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto. 24Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya.

Copyright information for IboBIU